Maka Munwa- Dicn

Onye Nwe Ebe a’

Dicn's Profile Photo 2
Dicn's Profile Photo 3
Dicn's Profile Photo 4

Aha m’ bu Donald IfesinaChi Chijioke Nwokolo. A n’akpokwa m’ Dicn /di:kn/. Mkpuruokwu ndi izizi n’ aha m’ ano ka m’ chikotara, o were ghoo Dicn.

Abu m’ onye a muru ka ubochi gbara 18, n’ onwa nke iri (October), n’ afo 1983, ma burukwa onye si na Nkeji-Obodo Enugwu (Enugu State) di na Nigeria.

Ka o siri gbasata okpukpe-okwukwe, abu m’ onye Yaahssogah n’ eso Yeshua Okpara Chineke

ma n’erubekwa isi nye ntuziaka Muonso Chineke.

Akaoru m’ gunyere Ide Akwukwo udi di iche-iche, dika Edemede Egwuregwu, Edemede Nwuli Mmuo, Edemede Nkowa, Edemede Mkpughe, Edemede gbasara Okpukpe-Okwukwe na udiri edemede ndi ozo di iche-iche.

A bukwa m’ Odee-Ukwe n’ede udiri ukwe di iche-iche, ma ndi uda ha di na Usoro Egwu Ndi Bekee, ma ndi di na Usoro Egwu Ndi Igbo, nakwa udiri ndi ozo di iche-iche.

A bukwazi m’ Okwe-Ukwe (Singer), Okwuu-ukwe/ Onye Ukwe Okwu (Rapper), Onye Nzulite Olu-Ndu (Soprano Voice Coach) n’ ukwe, Omee Ogba n’ Igbenkili (Filmmaker), Osee n’Igbeuwa (Graphics Designer), Onye Obii Akwukwo (Printer), Onye Ihe Nka-na-mma (Arts) n’ amasi, gunyekwa Ihe Mmasi (Interests) na Oru ndi ozo di iche-iche.

Ozokwazi bu na abu m’ Onye Okwu-N’Ora (Public Speaker) burukwa Onye Nkowaputa (Expositor), mana odide ma n’ okwu.

O dikwa ezi mkpa ikwu na abu m’ Onye Oke-Nchewaputa (Philosopher). Kama, enweghi m’ asambodo maka nke a’.

Obu m’ bidoro Okpukpe-Okwukwe Yaahssogah. Rue mgbe mu ga emepe ya nye ora, naani mu bu onye Yaahssogah ugbua- www.yaahssogah.biz

O bukwazi munwa meputara Asusu ohuru m’ ka n’ akwado iweputara ora, a n’ akpo Dicnei /di:kNei/- www.dicnei.com

E mepere m’ Ulo a’/ Ebe a’/ Onodu a’ maka Nkwalite asusu Igbo site n’uzo oma di iche-iche.

Leave a Reply

Your email address will not be published.